Ahụike n'ụlọ akwụkwọ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ahụike n'ụlọ akwụkwọ dịka otu n'ụlọ Akwụkwọ elementrị nke ogbe nke asatọ nọ na ụfọdụ mpaghara United States, Ana-akọwa ya dịka àgwà ma ọ bụ ọnọdụ nke ịdị mma, ọkachasị dịka ihe mgbaru ọsọ a na-achọsi ike.[1] A na-akụzi ahụike n'ụzọ isii maọbu asaa: Anụ ahụ, mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọgụgụ isi, mmetụta uche, ọrụ ime mmụọ na gburugburu ebe obibi. Ntinye nke abụọ na ikpeazụ bụ nruru ụka.[2][3] Ọ bụ ezie na nkuzi nke "ahụ nwatakịrị dum" yiri ka ọ bụ nkà ihe ọmụma oge ochie na ulọ-akwụkwọ, ohanaeze na-aga n'ihu na ule dị elu, enwere ọtụtụ ụlọ akwụkwọ dịka Montessori na nkà ihe ọmụma maọbu nkuzi ndị ọzọ, na-eji usoro mmụta akpọrọ ihe. Ihe ndị na-esonụ abụghị nkọwa gbasara nke ọbụla, kama ọ bụ naanị ihe ebu na uche nke bụ maka akụkụ ahụ obula.

Akụkụ anụ ahu ana-elekwasị anya na mpaghara atọ a bu: Iri nri dị mma, mmeghari ahụ, nakwa ahụ mmadụ (usoro mgbari nri, usoro ọkpụkpọ na usoro nrugharị ọbara).[4]

Maka K-5 ịhe nlekwasi anya nwere ike ịbụ na ụbụrụ nke na-achịkwa ahụ, ruo n'ịmụ akụkụ ụbụrụ. A na-atụ anya ka ụmụ akwụkwọ ghọta na akụkụ dị iche iche na-achịkwa ọrụ dị iche iche nke ahụ.[5]

Nwata akwukwo na akwo aka

Ụmụ akwụkwọ na-amụta usoro iji mee ka omume ha kwekọọ na ụwa gbara ha gburugburu.

Ụmụ akwụkwọ na-amụta ịchọpụta mmetụta na-adịghị mma na nke dị mma na usoro ịnagide ya.

Ụmụ akwụkwọ na-amụta ijikọ ọrụ ha chọrọ na nkwadebe dị mkpa.

Ụmụ akwụkwọ na-amụta mkpa na nkà nke nkwurịta okwu.

Ụmụ akwụkwọ na-amụta ijikọ omume nke ha na nke ezinụlọ ha na ahụike nke nọ gburugburu ha.[6]

Edensibia

  1. Wellness - Definition and More from the Free Merriam-Webster Dictionary. Merriam-webster.com (2012-08-31). Retrieved on 2013-11-03.
  2. Kathy on 1/04/2010 (2011-03-15). Defining Wellness: Hettler's Six Dimensions. Live Well. Kblog.lunchboxbunch.com. Retrieved on 2013-11-03.
  3. Wellness: Seven Dimensions of Wellness. Wellness.ucr.edu (2012-09-27). Retrieved on 2013-11-03.
  4. MyPyramid. Archived from the original on 2013-02-18. Retrieved on 2023-07-12.
  5. Neuroscience For Kids - lobes of the brain. Faculty.washington.edu (1998-09-13). Retrieved on 2013-11-03.
  6. Wellness: Environmental Wellness. Wellness.ucr.edu (2012-09-27). Retrieved on 2013-11-03.